ALA BU
OTU???
Ekwughi ekwu mere onu,
anughi anu mee nti. Agwa nti onughi, ebupu isi, nti esoro dapu, Ekweghi ekwe n'ute ekwere. Njiji
na-adighi anu ihe na-eso ozu ala n'ime ili. Umunne m, ala abughi otu ma ncha!!!
Ala bara nnukwu uru,
Γ³sΓ n'otu ihe a na-akwanyere nnukwu ugwu n'ala igbo. Ala nwere onye ma o bu ndi
nwe ya, nkea na-aputakaricha ihe n'oge a na-eke ekpe. Mmmadu enweghi ikike i ga
n'ala onye ozo mee ihe obula beeluso ma onye nwe ya bu ala onyere ya ikike ime
nke ahu. Mana ewepu ya, nsogbu izo ala ga-ada. Anyi ga-amata nke oma na ebe
obula nsogbu izo ala di,otutu ugboro, isi mmadu ga-adariri.
Ihe mgbanwoju anya di
ugbua bu okwu a ma o bu asusu a -"ALA BU OTU!!!"
Na nkowa nke m, Ala Bu
Otu putara na onye obula nwere ikike iga n'ala onye ozo mee ihe obula, ka a
ga-asi na o bu ya nwe ala ahu. Mana ekweghi m na nkea. Ala mmadu bu ala ya,
oburugodi na-egoro ya ego, mmuo onye nwe ala ahu ka di na ya. Ekwere na asusu
Ala Bu Otu bu okwu nkasi obi ma o bu okwu eji ekpuchi otutu ihe achoghi ikpo
aha.
Ejikoro otutu obodo onu
kpoo ya Naijiri n'afo 1914, mana a na-asi na Naijiria bu otu. Ebumnuche m
n'ederede a gbasakariri ndi Igbo nke ukwuu. Ndi Igbo bu ndi eji oke ime njem
were mara, n'ime obodo niile di n'uwa, okpekata mpe, otu onye Igbo ga anoriri
ebe ahu. Ndi Igbo ejirigo n'ihi ego kpoo ekwo nku na Ala Naijiria niile bu otu.
Ndi igbo ga-ahapa ala
ha gaba ala ndi awusa na ala ndi yoruba gaa wube nnukwu ulo oru, si otu a
na-ewebata mmepe n'ala ndi ahu. Otutu igbo echefugo na oburu na oso chuba ha na
ha enwekwaghi ebe mgbaba. Otutu ndi bi na ugwu awusa tukwasara obi ha n'ebe
enyi ha ndi awusa no n'ihi na omaara asu awusa ofuma. Mana achoro m iji ohere a
chetara anyi maka nwaada Imo steeti ebepuru isi na Kano n'ihi nkwughe onu umu
nwanyi n'ebe ya na onye awusa enyi ya no. (http://www.sugardaily.ng/2016/06/graphic-photos-of-igbo-christian-woman.html?m=1)(https://deltabreed.com/2016/06/04/graphic-photos-woman-beheaded-kano-blasphemy-prophet-muhammed/)
I gaa na Leegosu, oge a
na-acho iru uzo gara n'elu (bridge), akwatusiri otutu ulo ndi mmadu nke
imirikiti n'ime ha bu nke ndi Igbo. Mmmadu ole n'ime ha ka enyere ego nkasiobi?
Otu ihe a mere n'oge
nke Rufai na Abuja, imirikiti ndi akwaturu ulo ha bu ndi Igbo, ebe otutu ndi
igbo a arubeghi ihe obula n'ala ha di n'ala igbo.
Otutu oge, anyi na-eche
na o bu ka anyi siri wee ndi awusa ka ha si ewe anyi. Ebe o bu na obughi otu
okpupere CHI, onweghi mechaa ka eburu
otu ihe n'obi. Ka anyi saa anya anyi mmiri nke oma maara oge ekele gafere ihu
aka.
Abia n'ihe gbasara oru
nche nke obodo, anyi ga-amata ihe mere n'ubochi 30th May, ka esiri gbuo otutu
ndi Igbo n'ala ha, ndi na-eme njeghari udo. Ajuju m were buru na o bu na ndi
uwe ojii anoghi oge ebepuru nwada igbo isi na Kano, ka ha o na-eche ka goomenti
nye ha iwu? O buru na o bu nke a kpatara ya, ogosiri na goomenti nyere ndi nche
iwu ka ha gbagbuo otutu ndi igbo na-eme ngaghari udo. Umunne Ala abughi otu!!!!
Ihe ka si ewute m bu na
oke nchumpta ego na oke nkpoch nti anaghi ekwe ndi igbo anu ihe. Amaghi m ka
nsiri ga-ekwu nkea ka ha nu ma ghota ihe m na-ekwu. oturu m n'anya oge m nuru
na onwere otutu ndi igbo ka bi na Borno kemgbe nsogbu ndi Boko Haram bidoro ma
ruo ugbua.Tufiakwa!!!.
Lezie
ihe na-eme n'oge ugbu a n'ebe ndi Naija Delta no. O
ga-asi na ndi kporo onwe ha ndi Biafra bidoro ruba ulo oru niile a ha rugasiri
n'ala ndi ozo,n'ala Biafra, mmepe gaara idigo n'ala igbo niile, nsogbu a gaara
ebelata. Ozo dika ibe ya were buru na ndi goomenti amaghi na e nwere ewu ojii
ekwesiri icho acho ma ya foduzie icho ya bu ewu ojii n'oge chi di. Ufodu n'ime
ha ghara ego karia odimma obodo ya, ekwube okwu ulo ha di na Abuja.
Lekene ka uzo siri
Enugu gaa Onisha, ihe mberede okporo uzo na-eme oge niile n'ebe ahu mana gakene
n'ugwu awusa ka ihu ka onye igbo siri ruo uzo chara chara bara n'ulo oru ya.
Otutu ugboro, a na-anu
na uka di n'ala igbo na-akanye oke utu ego n'ebe ndi uka no, mana ngaghi echefu
okwu otu ukochukwu bi na Leegosu kwuru nke gbara m anya mmiri. "ejiri ihe
kariri nde nari naira ano were wube ulo uka a mana ahinze ndi igbo no na ya,
n'ihi na o bu ha mekasiri ihe niile di n'ulo uka a" Okwu fada a kwuru
gbawara m obi nke ukwuu. Umunne onwegodi ka oso siri gbaba ma o bu iraa mmuo,
ichetekwere na o bu n'ulo uka mmiri na-ama, nke di n'obodo gi, ka a ga-eji
kaara gi uka ? Onwekwara oge i ga-ano bido tobe onu na ulo uka eji eme onu di
n'obodo gi? O bu ihe a mere otutu ji ahapu mmemme ha kwesiri ime n'obodo ha, were
ga obodo ozo, n'ihi ihere obodo ya na-eme ya. Ngaghi ahapu ibunye ukpa ekele m
bugara ndi niile na-aka uka n'ulo uka di na St. Patrick catholic church,
Isuofia. N'agbanyeghi ndi ogaranya ha niile ha nwere, o bu umu agadi na umuaka
tukotara ego were ruharia ulo uka ha, ugbua oso n'ulo uka eji ama atu n'anambra
ma burukwazie ulo uka izizi emeghariri odido nso ya. O bu nwayoo nwayoo ka eji
aracha ofe di oku.
Bikonu umunne ka anyi
chebaa echiche ime mata na o nwere ebe anyi siri malite, ebe anyi siri puta.
Ala igbo na nke awusa abughi otu ma o bu nke ndi yoruba, ka anyi bidonu ugbua
dozibe obodo anyi, ositata diba mma,o dibara gbooo. O buru na anyi ruru ihe ndi
ahu anyi rugasiri n'ala ndi ozo n'ala anyi,nsogbu a di ugbua agaraghi idi.
Ozokwa, ndi igbo ka anyi hu o di mma anyi n'anya nke ukwuu karia ego.
N'ikpeazu, ndi igbo
nwere ndi awusa dika ndi nche ulo ha, ka anyi chetakwa na ndu onye nwe ulo di
onye nche n'aka. Oge ihe na-apasu ha ga-abia, o bukwa gi ka a ga-eji bido. Ihe
a niile na-eme ugbua kwesiri i di na-echetara anyi na ALA ABUGHI OTU, dika
ogbugbu ochu nke ndi ochu efi mere n'Enugu, igbupu isi nwaada Igbo na Kano, ogu
ndi Boko haram na ihe ndi ozoga. Ka anyi raruo ulo mata ka oke anyi siri diri.
Ka Chineke nyere anyi
aka ka anyi na-eme nke site na Kristi
Dinwenu anyi. AMEN
NWA BVN