ONYE
AGHOGBURU KA-AGBARA!!!
Ihe niile agbanwego,
n'agba ochie, a na-atu n'ilu na-asi na ihe okenye no n'ala were hu, nwata
kwurugodi oto ogaghi ahu ya. Mana
ugbua o bu nwata na-agwa okenye ihe o ga ahu. N'ihi gini? Otutu ndi kporo onwe
ha okenye kazi ndi bu umuaka ezuzu ezuzu (chetakwa na o bu nzuzu ka-eji aba
eligwe ooo).
Nigeria bu obodo mara
mma nke ukwuu, m gana asopuru obodo m bu Nigeria ma o di mma ma o di njo. Ma a na-anwu anwu ,ma a na-adi ndu. Nigeria ka bu
omaricha obodo m.
Nsogbu nchoputara ji ezigbo obodo m bu Nigeria bu na otutu ndi mmadu chere
na Nigeria ka kpuru isi dika o di n'oge gboo. Ebe mmadu ga-anara onyinye enyonyo
naani ka o were buru odibo onye ozo. Obughizi oge a ga-abia n'ulo gi nara nri
ma were nsi kwuo gi ugwo, ginwa ewere obi ocha nabata ya n'ihi udo na ndu gi.
Mbaaaa!!!! Nigeria ahula uzo, ìhè abatara!!!
Oge ugbua abughi oge a na-aturu ndi isi anyi n'ilu si "were ehihe
choba ewu ojii" n'ihe na chi ejibidogo ndi ochichi obodo m nke na ha na-ejidezi
aturu na-egosi anyi, chee na o bu ewu!!!
Ekelee m onye isi ala maka aha ojiri puta ochichi bu MGBANWE. Eziokwu ihe
na-agbanwe kwa ubochi, otutu ndi okenye na-eme ka umuaka ebe umuaka na-eme ka
onye, ndi okenye jizi asiri eme nri.
Kedu ka mmadu siri ga aputa n'ihu oha gwa ndi mmadu na o bu agha kpatara
uko tomato,(aha onye na-edu ya) hmmmm onwekwara ike i bu eziokwu ooo, makana ogbunigwe
nwere ike imebi ala ubi ebe a na-ako ihe. onye
aghogburu ka-agbara.
Ozo dika ibe ya were buru ihe na-eme n'obodo m n'oge ugbua, a na-atu n'ilu
na-asi na o bu sooso osisi ka a ga-asi na a ga-egbu ya, okwuru ebe okwu. Nna m
ukwuu bu onye isi obodo achokatago etu o ga-esi merie umunne m bu ndi Naija
Delta mana ochoputara na-obughi
egwu achi utaba na-aka were agba. Okpebiri i bonye onwe ya oya nti, oge o nuru
na umunne m si na o bu Aso rock bu ebe ozo ha ga-akpa mkpamkpa.
Umunne o buru gi bi
n'Aso rock i ga-ano hu ihe a ka o na-abia??? Onye isi m mere ihe okwesiri ime,
mana lezie ka Femi Adesina siri gosi amamihe ya, na o bu onye aghogburu ka
agbara site n'igwa oha mmadu na onweghi oya ji onye isi ala. Ebum n'uche na o
mere nke a ka okpuchie ihe ihere di na onye isi ala no n'oya nti mgbu. Adesina
jisiri ike na-emehe ike okuko chee na o na-egbochi ikuku(keduzi okenye anyi ga-esozi nókwu ahu ike onye isi ala anyi). Ma
ndumodu m na-enye onye isi ala bu ka o ka nodu ebe ahu tutu obi umu nne m
adatuooo. Mana o burukwa eziokwu na nti na-egbu ya, oputara na dokinta niile no
na nigeria enweghi ike igwo ya oya nti? aru!!!
Ozokwa echetere m ihe onye isi ala m
kwuru "onweghi onye obodo m ga-akwado maka i ga obodo oyibo maka ahu ike
beelu so ma oya ahu o siri ike ogwugwo na
nigeria,(http://www.punchng.com/no-allowance-officials-foreign-medical-treatment-fg/)
lekwanu ka onye isi na-abu onwe ya onu. onye
aghogburu ka-agbara.
Onye isi obodo m
anapugo otutu ndi mmadu ikike eji aga ala bekee, mana a na m ekele Ayodele
Fayose onye mara ya aka n'ihu si ya na onweghi ike nke a n'ebe ya onwe ya bu
Fayose no.(http://www.premiumtimesng.com/news/more-news/204385-fayose-dares-buhari-stop-travelling-abroad-says-i-cant-cowed.html)
onye aghogburu ka agbara
Keduzi ebe anyi na-aga
aga??? Kedu ka ihe ga-esi na-aga aga n'obodo ebe i ga-etete ura, otu olu a si
gi gbaba aka ekpe gi ,olu ozo asi gi gbaba aka nri, nwanne keduzi nke i ga-eme
na abughi ikwuru otu ebe.
Echetere m n'afo 2005,
October 23 ozi biara anyi na nwunye onye isi obodo m nwuru n'ulo ogwu di na
obodo Spain, onye o bula no na-eti mkpu nwute, Mana n'oge na-eteghi aka, ezite
ozi na o bu asi. Ihe mere ejiri kwuo na onwuru bu na ochoro igba oso, gbahapu
di ya bu onye isi ala n'ihi mmepa ahu o na-emekpa ndi Igbo. tufiakwa O bu etu a ka esiri mee n'afo
2010 n'oge Umaru Musa. Onye ka
aghogburu??
O dikwa m ka o bu na
gomenti ka o ka njo, "m ga-ebutu ego naira ka o buru otu ihe n'ebe dollar
no(
http://www.vanguardngr.com/2015/03/ill-make-naira-equal-in-value-to-dollar-says-buhari).
M ga-ebutu ego mmanu eji akwo ugboala ka o buru akpa ego abuo
(http://www.dailyafricagist.com/discussion/3143/suggest/ ) .Onwere onye ihe oma
na-aso nso? Onye obula ebinyesia aka n'oge nhoputa, keduzie onye aghogbuziri?.
O bu etu a ka esiri kwe umu mmadu nkwa oru n'otu steeti, mana ka-emesiri
nghoputa, mmadu ole ka-enyere oru? Onye aghoputakwara burukwuo onye anuruma. Onye aghogburu ka-agbara.
Abia n'egwuregwu,
nwatakiri muna ya gbara o no n'etiti n'oge anyi di na nwata gara igbara ndi no
n'abgata afo iri na asaa boolu hahahah,.
Agadi nwanyi na-ebu m uzo achiri oke n'oge anyi di na nwata kwadoro onwe ya
ofuma, gaba izo ada onicha "miss onitcha" emebeere maka ndi erubeghi
afo iri abuo na abuo, onye aghogburu!!!
N'otu obodo, n'akwamozu
otu onye nkuzi, otu akwukwo nke bekee kporo poster(nke ezinulo biputara) dere na nwoke a di afor iri ise na ano, mana
obere akwukwo ejiri nye onyinye nke bekee kporo jotter (nke umunne ya biputara)dere na odi afo iri isii na isii.
Ana ekwu ole ghara ole,
echetere m oge ekwuru n'okwu si na otu n'ime ihe bu aru okenye kwesiri i di
na-eze bu ASIRI mana ugbua aru gbaa afo o buru omenaala, okenye ma nwata jizi
asiri anafere n'ihe obula. Onyekwanu
ka i ga-ata uta? Ebe o bu na ikwuo eziokwu, inwere onwe gi n'ala eze eligwe ma
buru onye eji eji n'uwa. Ndi kporo onwe ha ndi ozioma Chineke na-ejizi aghugho
eri ego nke ha n'ihi nzuzu ndi uwa, ebe ndi uwa na-acho manna si n'eligwe. O bu
etu a ka otu ezinulo siri ree ihe niile ha nwere n'ihi ujo onye ozioma yiri ha, onye aghogburu ka agbara.
Ewepugo omumu na-akuzi
maka akuko n'ulo akwukwo Sekondiri,
n'udi ka ezobe otutu eziokwu mere n'oge ochie, mana ahinze ogbara igbo gharii
bu computa, ahinze googulu,echere m na ndi ochichi n'oke amamihe ha ga-egbochi
computa n'ulo akwukwo n'ihi na umu akuko a ha na-ezochi juru n'ime computa. Eziokwu
achoputara m na ka a na-agba mbo ka ejide
okuku ka ikuku ghapu iku ya,o bu oge ahu ka ezigbo ikuku na-ekughe ike ya.
Umunne m, oge erugo oge
anyi ga agbanwe, saa anya anyi mmiri mara oge aghogbuwere anyi. Ukpa ekele m na-
agara onye isi anyi weteere anyi MGBANWE were na-asi anyi na oge mgbanwe
eruola.Ka anyi jidesie aha ahu ike, ka anyi gbanweenu echiche ochie anyi. Ime
ihe obodo na uka kwuru mara mma nke ukwuu mana ikwesiri inyocha ofuma ufodu
iwu, ka iwere mata oge oke gi na-efu. Ekwena ka aghogbuo gi, ma gi aghogbukwana
mmadu, ka udo were na-achi n'ala anyi a.
Ka amra Chineke
chekwaba anyi n'oge niile nke ndu anyi amen.
Nwa BVM